Linda Ejiofor-Suleiman kọwaara BBC News Igbo etu ya na di ya bụ Ibrahim Suleiman si akwado onwe dịka di na nwunye na-eme ejije na mkparịtaụka a ma kwuo ọtụtụ ihe ndị ọzọ ọkachasị nrute oyinye AMVCA abụọ o ritere.
#bbcnewsigbo #bbcigbo #lindaejofor #amvca
A na-ebo Blessing CEO ebubo iji aghụghọ napụ otu onye nde Naịra iri atọ na isii maka igonye ya ụlọelu nwere ọnụụlọ isii na Lekki dị na Legọs Steeti.
#blessingceo #lekki #lagos #bbcnewsigbo #bbcigbo
Ụlọikpe asịla ka EFCC kpọga @blessingceobeautycosmetics n'ụlọ mkpọrọ ha.
Ụlọọrụ Economic na Financial Crimes Commission EFCC, ngalaba dị na Legọs, akpọgala onye a ma ama n'onyonyo soshal media bụ Okoro Blessing Nkiruka, onye a na-akpọ Blessing CEO, n'ihu Ụlọikpe Ukwu dị na Ikoyi n'ụbọchị Fraịde.
Ndị EFCC na-ebo ya ebubo aghụghọ na nri mmadụ ruru nde naịra iri atọ na isii.
Blessing CEO ga a zara ọnụ ya n’ebubo abụọ gbasara nnata ego n'ụzọ aghụghọ nakwa izu ohi.
Ndị EFCC na-ekwu na o riri Oriakụ Ifeyinwa Nonye Okoye nde naịra iri atọ na isii (N36 million) n'ụzọ aghụghọ maka azụmahịa ala na ụlọ na Lekki.
Onye a na-ekpe ikpe, bụ Blessing CEO, kwuru na aka ya dị ọcha ma gọnahụ ebubo niile a boro ya n'ụlọikpe
N'ịzaghachi, Ọka Ikpe D.I. Dipeolu nyere iwu ka a kpọchie ya n'aka ndị EFCC tupu ọ mezue usoro mgbapụta ya, ma yigharịa ikpe ahụ ruo ụbọchị nke ise na June, 2026.
#bbcigbo #bbcnewsigbo #Efcc #Blessingceo
📸BlessingCEO na 📸EFCC
Kirie ka nne a jiri obi ike na-enyere nwa aka n'ọnọdụ ahụike scoliosis o nwere, kedụ ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ gị?
#bbcnewsigbo #bbcigbo #BBCIgbo #scoliosis #girlchild
Aka ndị uweojii Enugwu Steeti kpaara nwaanyị a maka ebubo itigbu nwa di ya.
Gụọ ka ihe a si mee n'uju n'akara ozi anyị 👇
#bbcnewsigbo #bbcigbo #BBCIgbo #enugu #childabuse #family